Leviticus 15:1-5

Ihe nsọpụta ndị na-ebute adịghị ọcha

1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha, 2“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nwoke ọbụla ihe nsọpụta si nʼahụ ya na-asọpụta, bụ onye rụrụ arụ. 3Onye ahụ rụrụ arụ mgbe ihe ahụ si ya nʼahụ na-asọpụta, rụọkwa arụ mgbe ihe ahụ kwụsịrị ịsọ. Otu a ka ihe ọsụsọ ahụ si eme ka onye ahụ rụọ arụ.

4“ ‘Ihe ọbụla onye ahụ ji anọdụ ala, maọbụ nke o ji dinaa bụ ihe rụrụ arụ. 5Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya, na ahụ ya mmiri.
Copyright information for IboBIU